Deuteronomy 27

Ebe ịchụ aja nʼugwu Ebal

1Mosis na ndị okenye Izrel nyere ndị Izrel iwu sị, “Debenụ iwu ndị a niile m na-enye unu taa. 2Mgbe ị gabigara osimiri Jọdan ruo nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, bukọtaanụ nkume buru ibu nʼotu ebe, jirikwa ụrọ ọcha techie ha. 3Depụta nʼelu nkume ndị ahụ iwu na ụkpụrụ ndị a mgbe ị batara nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, nke Onyenwe anyị Chineke nna nna gị kwere nkwa inye gị. 4Mgbe ị nọkwa nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, doo nkume ukwu ndị a nʼugwu Ebal, dịka m na-enye gị nʼiwu taa. Jirikwa ụrọ ọcha techie ha. 5Wuokwara Onyenwe anyị Chineke gị ebe ịchụ aja ya nʼebe ahụ. Ebe ịchụ aja eji naanị nkume wuo, nke ejighị ihe ngwa ọrụ igwe rụọ ihe bụla na ya. 6Jiri nkume a na-awaghị awa wuore Onyenwe anyị Chineke gị ebe ịchụ aja ahụ, chụọkwa aja nʼelu ya nye Onyenwe anyị Chineke gị. 7Chụọ aja udo nʼebe ahụ, rie ha, ma ṅụrịakwa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị. 8Depụta iwu ndị a nke ọma, nʼelu nkume ndị ahụ i guzobere.”

Ịbụ ọnụ site nʼugwu Ebal

9Mgbe ahụ, Mosis na ndị nchụaja, bụ ndị Livayị, gwakwara ndị Izrel niile okwu sị, “Nọọnụ jii, gị Izrel, gekwaa ntị! Taa, ị ghọọla ndị nke Onyenwe anyị Chineke unu. 10Nʼihi ya debe iwu niile Onyenwe anyị Chineke gị na ụkpụrụ niile ndị m nyere gị taa.”

11Nʼotu ụbọchị ahụ ka Mosis nyere ha iwu sị,

12Mgbe unu gafere Jọdan, ebo ndị a: Simiọn, na Livayị na Juda na Isaka na Josef na Benjamin, ga-eguzo nʼelu ugwu Gerizim gọzie ụmụ Izrel 13Agbụrụ Ruben, Gad, Asha, Zebụlọn, Dan na Naftalị ga-eguzo nʼelu ugwu Ebal kwupụta ọbụbụ ọnụ.

14Ndị Livayị ga-eji olu dị elu gụpụta ya nye ụmụ Izrel niile,

15“Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-apị arụsị maọbụ oyiyi ọbụla, akaọrụ onye ǹka, nke bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị, ma na-eguzobe ya na nzuzo.”


Ndị mmadụ niile ga-aza sị, “Amen.”
16“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-elelị nna ya na nne ya.”


Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
17“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-ehigharị oke ala onye agbataobi ya.”


Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
18“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-eduhie onye ìsì ụzọ.”


Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
19“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ.”


Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
20“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-abakwuru nwunye nna ya soro ya dinaa, nʼihi na o merụọla ihe ndina nna ya.”


Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
21“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke ya na anụmanụ ọbụla na-edina.”


Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
22“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nwanne ya nwanyị na-akwa iko, bụ nwanne ya nke nne ya mụrụ, maọbụ nke nwunye nna ya mụrụ.”


Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
23“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nne nwunye ya na-edina.”


Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
24“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-etigbu mmadụ ibe ya na nzuzo.”


Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
25“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-anara ngarị maka itigbu onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.”


Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
26“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-adịghị eme ka iwu ndị a guzosie ike site na-edebeghị ha.”


Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Copyright information for IboBIU